Igbo Mask Kola Nut Flower  
Resources for Igbo Language Students
At The Market Place

To listen to the dialogue, click on the speaker icons.

To save the MP3 files to your computer, right click the speaker icon, click the "Save Target As. . ." menu item, then use the pop-up dialogue box to choose a location on your PC in which to store the file. Once it has downloaded, you can transfer the file to your MP3 player if you wish.

Description Resource
English & Igbo (MP3)
Audio
Documentation (PDF)
Documentation



At Home

Wife

Di m, a na m eje ahia. O nwere ife ị chọrọ ka m gotara gi?

Husband, I am going to the market. Is there anything you want me to buy for you?

Husband

E! Biko, inwere íké igotere m únèrè, ọrọmá, ọkụkọ, ji, ogede na azụ.

Yes! Please, can you buy me some bananas, oranges, chicken, yam, plantain and fish.

Wife

E, enwere m ike igote ha. O nwere ife ọzọ e choro ka mụ gote.

OK I will. Anything else?

Husband

Mba, daalu.

No, thanks.

Wife

Ọọ. Ka ọ mesia.

OK. See you later.


At the Market


To Seller # 1

Wife

Onye ahia ndeewo!

Market Person greetings!

Seller #1

Ndeewo

Greetings.

Wife

Achoro m igo ji na ogede

I would like to buy yam and plantain

Seller #1

O bu ole ka i choro?

How many do you want?

Wife

Biko, nye m ji ato na ogede abuo


O bu ego ole ka i na-ere ha?

Please give me 3 yams and 2 plantains.


How much are you selling it for?

Seller #1

O bu naira ano.

It is 4 naira.

Wife

Aga m enye gi naira ato!

I will pay you 3 naira!

Seller #1

Ngwa, weta ego!

OK, bring the money.

Wife

Daalu.

Thanks.

Seller #1

I choo igo akidi?

Do you want to buy some beans?

Wife

O bu ego ole ka i na-ere ha?

How much do they cost?

Seller #1

O bu naira isii.

They are 6 naira.

Wife

Mba! O di oke onu.

No! They are too expensive.

Seller #1

Akidi m maka chara mma n’ahia!

My beans are the best in the market!

Wife

Achoro m igo akidi a.

Mana, ị nwere ọrọmá?

I don’t want to buy the beans.

But, do you have oranges?

Seller #1

Mba ọrọmá agwula. Bia echi

No the oranges have finished. Come back tomorrow.

Wife

Oo. Kedu ebe m ga-egote azụ?

NB. azụ [ázù] = fish
àzụ = back, behind

Ok. Where can I buy fish?

Seller #1

Odu azụ di n’àzụ àzụ ahia.

NB. azụ [ázù] = fish
àzụ = back, behind

The fish stall is at the end of the market

Wife

Otere anya?

Is it far?

Seller #1

Mba, o di nso

No, it is near.

Wife

Daalu Chukwu!

Ah! Kedu ebe a na-ere ọkụkọ?

Thank God!

Oh! And where do they sell chicken?

Seller #1

N'ebe ahụ na akụkụ nwaanyi ahụ yi ichafo ocha.

Over there near the woman wearing a white head-scarf.

Wife

Daalu.

Thanks

Seller #1

Oo.

Ok.


To Seller # 2


Kedu!

Hello

Wife

Ego olee bụ otu ọkụkọ?

How much does a chicken cost?

Seller #2

Otu ọkụkọ bụ naịrà àbụọ.

A chicken costs 2 naira.

Wife

O-ooo! Ó dị onu!

Ị ga-ere àbụọ naịrà atọ?

O-oh! That's expensive!

Will you sell me two for 3 naira?

Seller #2

Ah!

Ị na-eme ka!

Ngwa, weta ego!

Ah!

You are just trying your luck!

OK, bring the money!

Wife

Oo. Ngwa lee ego.

Ha! OK. Here's the money.

Seller #2

Daalu

Thanks.


To Seller # 3

Wife

Ego ole ka ị na-ere únèrè?

How much are the bananas?

Seller #3

O naịrà atọ.

They cost 3 naira.

Wife

Ị ga-ere ha otu naịrà?

Will you sell them for 1 naira?

Seller #3

Mba, aga m ere ha naịrà abuo.

No but I'll sell them for 2 naira.

Wife

Oo, were ego! Nye m únèrè.

OK, take the money. Give me the bananas.

Seller #3

Daalu.

Thanks


On the way home. . .

Wife

Kita, egotala m ife hine, àkpà m dị alo!

Now, I have bought so many things, my bag is heavy!